1 Kings 16

1Mgbe ahụ, ozi Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya, 2“Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha. 3Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat. 4 Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.”

5Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel? 6Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze.

7Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ.

Ela, eze Izrel

8Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.

9Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke. 10Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.

11Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile. 12Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu. 13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.

14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?

Zimri, eze Izrel

15Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha. 16Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile. 17Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha. 18Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ, 19nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie.

20Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?

Omri, eze Izrel

21Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat. 22Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel.

23Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza. 24Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.

25Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ. 26Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha.

27Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel? 28Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

Ehab, aghọọ eze Izrel

29Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria. 30Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ. 31Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn. O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe. 32O guzobere ebe ịchụ aja nye Baal, nʼụlọ arụsị Baal nke o wuru na Sameria. 33Ehab manyere ogidi chi Ashera, si otu a kpasuo Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel iwe karịa otu ndị eze Izrel niile bu ya ụzọ chịa si mee.

34Mgbe Ehab na-achị, ka Hiel, onye Betel, wughachiri obodo Jeriko. Ọkpara ya bụ Abiram nwụrụ, mgbe ọ tọrọ ntọala obodo ahụ, ka ọ guzobere ọnụ ụzọ ama ya ọtọ, nwa ya nwoke nke nta aha ya bụ Segub nwụrụ, imezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Joshua nwa Nun.

Copyright information for IboBIU